Published - Wed, 19 Jan 2022

Ndị Enugwu-Ukwu Emeela Emume Ịgụ Arọ

Ndị Enugwu-Ukwu Emeela Emume Ịgụ Arọ

Ọ bụnnọọ emume 'ụwa bịa kirie' dịka ndị obodo Enugwu-Ukwu dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Njikọka nke steeti Anambra nọrọ na nsonso a wee merùbé otu n'ime nnukwu emume pụrụ iche e jiri mara obodo ahụ, bụ emume Ịgụ Arọ.

Ya bụ emume Ịgụ Arọ bụ àgbà nke iri isii na anọ ya (64th) a na-eme n'obodo ahụ kemgbe e jiri malite ya, ma bụrụkwa àgbà nke iri na otu (eleventh) nke eze ọdịnala obodo ahụ ugbua, bụ Igwe Ralph Ekpeh megoro kemgbe o jiri banye n'ọkwa ọchịchị dịka eze ọdịnala obodo ahụ

Ya bụ nnukwu emume omenahọ wèèrè ọnọdụ n'Obu-Ụmụnri, ma bụrụkwa nke dọtara imirikiti ndị mmadụ sitere mpaghara ebe dị icheiche wee bịa, iji were anya ha gbara ekeresimesi. 
  
A nọrọ na mmemme ahụ wee gosipụta ịmamma nke ọnatarachi na omenala Igbo, ma nọrọkwa na ya bụ mmemme chie ụfọdụ ụmụafọ obodo ahụ echichi ọdịnala, nke  gụnyere onye nnọchianya ala Nigeria na mba Burundi, bụ Maazị Elijah Onyeagba, nakwà ọtụtụ ndị ọzọ, iji kelee ma gbàá ha ume maka ntụnye dị icheiche ha na-atụnye n'ịkwàlìtè mmepe obodo na ime ka aha obodo ahụ chawapụta.

N'okwu ya oge ọ na-awa ọjị na mmemme ahụ, eze ọdịnala Enugwu-Ukwu, bụ Igwe Ralph Ekpeh kọwàrà na emume Ịgụ Arọ bụ otu n'ime ụzọ obodo ahụ si enye Chineke ekele maka ahọ gwụrụ agwụ, kpeere Ya maka ahọ ọhụrụ na ahọ kacha mma n'ọdịnihu, gosipụtárá ụwa omenala obodo ahụ, ma nyekwa nkwanyeugwu nyegara ndị dị icheiche tụnyegoro ụtụ pụrụ iche n'ịkwàlite mmepe obodo ahụ. 

Ọ sịkwa na ha na-anọ na mmemme ahụ na-ekele Chineke maka ngọzị ya n'isi ụmụafọ Enugwu-Ukwu, ma na-arịọkwa ezi ihe n'isi obodo ahụ.

N'okwu ha gwara ndị nta akụkọ na mmemme ahụ, onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo Njikọka nke mbụ n'ụlọ omeiwu steeti Anambra, bụ Maazị Timothy Ifedioramma; na onyeisi ọchịchị obodo ahụ, bụ Maazị Bonny Ozonkwuaku kwupụtara mkpà ọ dị ka ndị Igbo na-egosipụta njirimara ha ma kwụdosie ike n'omenala ha dịka Ndị Igbo, jirikwa ha na-eme ngala, n'ihi na ọ bụ njirimara onye na-akọwa ebe onye si.

N'aka nke ya, otu onye n'ime ndị e chiri echichi ọdịnala ụbọchị ahụ ma bụrụkwa onyeisi ụlọọrụ Lynden Farms nàkwà onyeisi ụlọọrụ -P Infrastructure, bụ Dọkịta Clem Nwogbo, onye e chibere echichi ụbọchị ahụ dịka ‘Akudo Enugwu-Ukwu na Ụmụnri’ gosipụtàrà obiañụrị ya maka nke ahụ, kwupụta ịhụnanya na ezi mmasị o nwere n'ihe gbasaara omenala Igbo, ma kelekwazie ndị Enugwu-Ukwu maka ịhụta ya dịka onye kwesiri ekwesi inye nkwanyeugwu ahụ pụrụ iche. 

Dịka ọ na-akọwa echichi ọdịnala ahụ e nyere ya dịka nnukwu ihe agbamume, o kwupụtazịkwara mkpebi ya ịga n'ihu na-arụ ezi ọrụ ma na-emekwa ihe dị icheiche ga na-akwàlite mmepe obodo na ọdịmma ụmụ mmadụ, dịka o si eme na mbụ.

Ọtụtụ ndị ọzọ sonyere na mmemme ahụ gụnyere onyeisioche otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'All Progressives Grand Alliance, APGA', bụ Ọzọmkpụ Victor Oye; onye nọchitebụrụ anya ọgbọ nta nkwàdo Anambra Etiti n'ụlọ omeiwu Sinet, bụ Chiifu Victor Umeh; onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo Idemili North na South n'ụlọ nnọchianya etiti, bụ Maazị Obinna Chidoka; Kọmishọna na-ahụ maka ewumewu ụlọ na steeti Anambra, bụ Maazị Michael Okonkwo; onyeisi ụlọọrụ 'Anambra Broadcasting Service, ABS', Dọkịta Uche Nworah; nnukwu onye ndụmọdụ pụrụ iche nye Gọvanọ Obiano n'ihe gbasaara nchekwa, bụ 'Retired Air Vice Marshall Ben Chiobi', tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

Created by

Chidi Igwe

Thank you for visiting today. You are in good hands. I have been teaching French language and linguistics at the University of Regina (Canada) since 2007. I have been teaching Igbo language and culture online since 2009. I look forward to working with you in your journey to grow your knowledge and linguistic competence in Igbo and French languages. Dr. Chidi Igwe was born in Nigeria and trained in Canada. With an MA in French Linguistics from the University of Regina, and PhD in Applied Linguistics from Dalhousie University, Halifax, he is currently an Assistant Professor at the University of Regina (Canada), where he’s been teaching since June of 2007.


View profile

Comments (0)

Search
Popular categories
Latest blogs
Akụkọ Ifo: Ihe Mere Na Ezi Enweghị Mpi
Akụkọ Ifo: Ihe Mere Na Ezi Enweghị Mpi
Ifo shàkpii...Wọ́ọ̀...Ifo shàkpii...Wọ́ọ̀...Nkịta nyàrá àkpà...Nsị agwụ n'ọhịa...Obuisi nyara àkpà...Akara agwụ n'ahịa...Ọ nwere akụkọ m ga-akọrọ ụnụKọọrọ anyị ka obi dị anyị mma...***********************************ISIOKWU:Isiokwu akụkọ m taa bụ Ihe Mere Na Ezi Anaghị Epu Mpì.Malite n'okike ụwa, anụmanụ a na-akpọ ezi nwere mpì.Kaosiladị, o ji mpì ya ahụ wee na-alụso ụmụanụmanụ ibe ya (ndị enweghị mpì) ọgụ oge niile ma werekwa ya na-akpa ike dị egwu.Ịchọ okwu a na akpramagwa mmegide ahụ ezi na-akpa bidoro webe ụmụanụmanụ ndị ọzọ iwe; mana o nweghị ihe ha pụrụ ime. Ha gaa nzukọ, ezi agaghị ekwe ka anụmanụ ọzọ tinye ọnụ n'okwu, onye mee pịm maọbu gbaghaa okwu ya, o bido ọgụ ozigbo, ma jiri mpì ghasàsịa ihe niile a na-eme ebe ahụ.Ihe ndị a niile na-eme; mana ọ ruru otu ụbọchị, nke ka nke wee mee. Ụbọchị ahụ, nkịta nọ na mmiri na-ańụ mmiri, ezi gbadata na mmiri wee sị nkịta pụọ ebe ahụ ka ya onwe ya ńụọ mmiri. Nkịta gwara ezi na ya ańụchàbèghị̀ mmiri, n'ihi na afọ ejubèghị̀ ya. Ya mere, ọ jụrụ na ọ gaghị apụta na mmiri ahụ ruo mgbe ọ nụ̀juru afọ.Oge nkịta kwuchara nke a, ọ malitekwara ńụba mmiri; ezi wee jiri oké iwe makwasa ya n’ike dị egwu, ma were mpi ya merụchaa ya ahụ. Ọ fọrọ obere ka nkịta nwụọ ụbọchị ahụ n'ihi ihe ezi mere ya.Oge ha nụrụ ya, ihe ahụ ezi mere nkịta enyeghị ụmụanụmanụ ndị ọzọ ọnụ okwu. N'ihi nke a, ha nọrọ nzukọ na nzuzo, n'emeghị ka ezi mara. Ha nọrọ na nzukọ ahụ wee kpebie ma kwekọrịta na ézè ha bụ mbe ga-aga na be chi okike kere ha gwa ya ka ọ napụ ezi mpi o nyere ya, n’ihi na a hapụ ya ka o jiri aka ahụ na-aga, ị mara na ọ ga-egbucha ụmụmanụ niile otu ụbọchị. Mbe nabatara okwu ha, wee debe aghụghọ e jiri mara ya n'otu akụkụ, n'ihi na nke ahụ soro metụta ya.N'ọnụ ụtụtụ echi ya, mbe zọpụrụ ụkwụ ije, wee gaa na nke chi okike. Mgbe ọ garuru, ọ kọwaara ya ihe niile ezi na-eme na ihe ụmụanụmanụ chọrọ ka o mee. Ka ọ nụchara mkpesa ahụ, chi okike kwetere ime ihe ụmụanụmanụ rịọrọ ya; o wee napụ ezi mpi ya ozigbo, ma mee ka ntị ya nọrọzie n'ọnọdụ̀ ebe ahụ mpi ya dịbụ n'isi ya, ka owee jiri ya na-anụ ihe ngwangwa. Ọ bụ etu ahụ ka ezi si wee bụrụ anụ enweghị mpi, wee ruo taa. Ọ bụkwa ya mere na ị hụzie ezi taa, ntị ya akpalisie elu, dịka a ga-asị na ọ bụ mpi.IHE MMỤTA: Onye ejila ihe o nwere wee megide maọbu mekpàá mmadụ ibe ya ahụ, maka na chi nyere ya ihe ndị ahụ pụkwàrà ịnakọrọsị e n'otu ntabianya.

Wed, 19 Jan 2022

Ndị Enugwu-Ukwu Emeela Emume Ịgụ Arọ
Ndị Enugwu-Ukwu Emeela Emume Ịgụ Arọ
Ọ bụnnọọ emume 'ụwa bịa kirie' dịka ndị obodo Enugwu-Ukwu dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Njikọka nke steeti Anambra nọrọ na nsonso a wee merùbé otu n'ime nnukwu emume pụrụ iche e jiri mara obodo ahụ, bụ emume Ịgụ Arọ.Ya bụ emume Ịgụ Arọ bụ àgbà nke iri isii na anọ ya (64th) a na-eme n'obodo ahụ kemgbe e jiri malite ya, ma bụrụkwa àgbà nke iri na otu (eleventh) nke eze ọdịnala obodo ahụ ugbua, bụ Igwe Ralph Ekpeh megoro kemgbe o jiri banye n'ọkwa ọchịchị dịka eze ọdịnala obodo ahụYa bụ nnukwu emume omenahọ wèèrè ọnọdụ n'Obu-Ụmụnri, ma bụrụkwa nke dọtara imirikiti ndị mmadụ sitere mpaghara ebe dị icheiche wee bịa, iji were anya ha gbara ekeresimesi.   A nọrọ na mmemme ahụ wee gosipụta ịmamma nke ọnatarachi na omenala Igbo, ma nọrọkwa na ya bụ mmemme chie ụfọdụ ụmụafọ obodo ahụ echichi ọdịnala, nke  gụnyere onye nnọchianya ala Nigeria na mba Burundi, bụ Maazị Elijah Onyeagba, nakwà ọtụtụ ndị ọzọ, iji kelee ma gbàá ha ume maka ntụnye dị icheiche ha na-atụnye n'ịkwàlìtè mmepe obodo na ime ka aha obodo ahụ chawapụta.N'okwu ya oge ọ na-awa ọjị na mmemme ahụ, eze ọdịnala Enugwu-Ukwu, bụ Igwe Ralph Ekpeh kọwàrà na emume Ịgụ Arọ bụ otu n'ime ụzọ obodo ahụ si enye Chineke ekele maka ahọ gwụrụ agwụ, kpeere Ya maka ahọ ọhụrụ na ahọ kacha mma n'ọdịnihu, gosipụtárá ụwa omenala obodo ahụ, ma nyekwa nkwanyeugwu nyegara ndị dị icheiche tụnyegoro ụtụ pụrụ iche n'ịkwàlite mmepe obodo ahụ. Ọ sịkwa na ha na-anọ na mmemme ahụ na-ekele Chineke maka ngọzị ya n'isi ụmụafọ Enugwu-Ukwu, ma na-arịọkwa ezi ihe n'isi obodo ahụ.N'okwu ha gwara ndị nta akụkọ na mmemme ahụ, onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo Njikọka nke mbụ n'ụlọ omeiwu steeti Anambra, bụ Maazị Timothy Ifedioramma; na onyeisi ọchịchị obodo ahụ, bụ Maazị Bonny Ozonkwuaku kwupụtara mkpà ọ dị ka ndị Igbo na-egosipụta njirimara ha ma kwụdosie ike n'omenala ha dịka Ndị Igbo, jirikwa ha na-eme ngala, n'ihi na ọ bụ njirimara onye na-akọwa ebe onye si.N'aka nke ya, otu onye n'ime ndị e chiri echichi ọdịnala ụbọchị ahụ ma bụrụkwa onyeisi ụlọọrụ Lynden Farms nàkwà onyeisi ụlọọrụ -P Infrastructure, bụ Dọkịta Clem Nwogbo, onye e chibere echichi ụbọchị ahụ dịka ‘Akudo Enugwu-Ukwu na Ụmụnri’ gosipụtàrà obiañụrị ya maka nke ahụ, kwupụta ịhụnanya na ezi mmasị o nwere n'ihe gbasaara omenala Igbo, ma kelekwazie ndị Enugwu-Ukwu maka ịhụta ya dịka onye kwesiri ekwesi inye nkwanyeugwu ahụ pụrụ iche. Dịka ọ na-akọwa echichi ọdịnala ahụ e nyere ya dịka nnukwu ihe agbamume, o kwupụtazịkwara mkpebi ya ịga n'ihu na-arụ ezi ọrụ ma na-emekwa ihe dị icheiche ga na-akwàlite mmepe obodo na ọdịmma ụmụ mmadụ, dịka o si eme na mbụ.Ọtụtụ ndị ọzọ sonyere na mmemme ahụ gụnyere onyeisioche otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'All Progressives Grand Alliance, APGA', bụ Ọzọmkpụ Victor Oye; onye nọchitebụrụ anya ọgbọ nta nkwàdo Anambra Etiti n'ụlọ omeiwu Sinet, bụ Chiifu Victor Umeh; onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo Idemili North na South n'ụlọ nnọchianya etiti, bụ Maazị Obinna Chidoka; Kọmishọna na-ahụ maka ewumewu ụlọ na steeti Anambra, bụ Maazị Michael Okonkwo; onyeisi ụlọọrụ 'Anambra Broadcasting Service, ABS', Dọkịta Uche Nworah; nnukwu onye ndụmọdụ pụrụ iche nye Gọvanọ Obiano n'ihe gbasaara nchekwa, bụ 'Retired Air Vice Marshall Ben Chiobi', tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

Wed, 19 Jan 2022

NDLEA Ebibiela Ọgwụike Gburu Ego Ruru Ijeri Naịra Iri Ise n'Abuja
NDLEA Ebibiela Ọgwụike Gburu Ego Ruru Ijeri Naịra Iri Ise n'Abuja
Ọ na-adị mma e gbuo ìrùrò e suo ya ọkụ, maka ndụgha.N'ịgbasò nke a, ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka ibu agha megide ịkpọ, ịñụ, ire maọbụ ịtụ mgbere ọgwụike n'ala Nigeria, bụ ụlọọrụ 'National Drug Law Enforcement Agency' (NDLEA) nọrọ ụbọchị Tuzdee wee bibie ọtụtụ ọgwụike gburu ego ruru ijeri kwuru ijeri naịra n'Abụja bụ isi obodo ala Nigeria.N'okwu ya oge a na-ebibì ọgwụike ahụ na mpaghara FCT, onyeisi ụlọọrụ NDLEA n'ala Nigeria, bụ Brig. Gen. Mohamed Buba Marwa kọwara mbibi ahụ e bibiri ọgwụike ahụ n'ihu ọhaneze dịka nke magburu onwe ya nà ngosipụta ezi nkwụdosiike ụlọọrụ ahụ dị n'ibu agha megide ọgwụike.Marwa, nke onye nọchitere anya ya na mmemme ahụ bụ odeakwụkwọ nke ụlọọrụ ahụ, Ọkaiwu Shadrach Haruna, kwuru na ọnụọgụ ọgwụ ndị ahụ a na-ebibi bụ ihe ncheta maka oke nsogbu ọgwụike n'ala Nigeria.Ọ sị "Anyị nwere ike icheta na mgbe Onyeisiala Muhammadu Buhari malitere mgbasaozi na ibu agha megide ọgwụike, nke a kpọrọ 'War Against Drug Abuse (WADA) n'asụsụ bekee, ma bụrụkwa nke e mere n'okpuru nhazi ụlọọrụ NDLEA na June 26, 2021, o kwupụtara na WADA agaghị abụ naanị aha, kama na ọ bụ ọkpụkpọòkù ọrụ nyegara ụmụafọ Nigeria niile. Taa mbibi ọgwụike a ruru tọn iri abụọ 20, agaal n'ihu ịgba ezi ama maka nke ahụ.”Ọ gara n'ihu kọwaa na ọgwụike ahụ e bibiri ebe ahụ ụbọchị ahụ ruru kilogram 20,000 ma bụrụkwa nke gburu ijeri kwueu ijeri naira. O kwukwara na ihe ruru kilogram 19,598 n'ime ọgwụike ndị ahụ bụ nke e jidere site n'aka ndị ọrụ NDLEA na ngalaba FCT, nke gụnyere 19,178 kilos nke ọgwụike cannabis, 0.1 kilogram nke ọgwụike cocaine, 0.009  kilogram nke ọgwụike heroin, na 420 kilogram nke ụdị ọgwụike ndị ọzọ a kpọrọ psychotropic n'aha nchịkọta bekee.Ọ kọwara na ọ bụ n'ọdụ ụgbọelu 'Nnamdi Azikiwe International Airport, Abuja' ka e jidere ọgwụike ndị ọzọ e sokwa wee bibie ụbọchị ahụ, nke gụnyere cocaine ruru kilogram 173, kilogram heroin ruru 36, kilo ephedrine ruru 93, kilogram methamphetamine ruru 60, gram 58 nke ọgwụike cannabis, gram 219 nke ọgwụike Rohypnol na gram 150 nke ọgwụike Tramadol.Ọ sị "Dịka anyị na-ahụ ka a na-ebibi ọgwụike a ruru kilogram 20,000 n'ihu ọhaneze taa, ọ dị mma ka m mee ka ị mara na e nweela ụdị mbibi dị etu ahụ n'ọtụtụ steeti na mpaghara ebe dị icheiche n'ala Nigeria n'ahọ a. Tụlegodinụ ụdị ọnọdụ izendụ na ihe égwù kaara ịdapụta ma ọ bụrụ na ọgwụike niile a bàrà n'obodo."Marwa kwuru na ọ bụ ndị ọrụ ha nọ na FCT na ọdụ ụgbọelu mba ụwa 'Nnamdi Azikiwe International' nwụchiri ọgwụike niile ahụ, ma kọwaa na nke ahụ na-egosi na NDLEA adịghị akwụsị akwụsị na mbọ ọ na-agba iji kwalite nchekwa na ọdịmma nke ụmụafọ Naijiria pụọ n'ọgwụike. Ọ gara n'ihu kọwaa na mbibi ahụ ha bibiri ọgwụike ahụ dabàrà adabà n'ịgbaso iwu nke 'National Environmental Standards and Regulations Enforcement Agency (NESREA)' dịka ụzọ kacha mma isi kpochapụ ọgwụike.Ka ọ na-ekwu na ọnụọgụ ọgwụike ndị a na-ebibi bụ ihe ncheta maka oke nsogbu ọgwụ na mba ahụ, Marwa kwuru na mmetụta dị egwu nke ọnụọgụgụ ọgwụike na-enwe n'obodo na na ndụ ụmụafọ Nigeria bụ ihe mere ụlọọrụ NDLEA n'okpuru ndu ya ji kwlitekwuo mbọ ọ na-agba ugbua n'ibu agha megide ọgwụike n'ala Nigeria.Ọ sị na n'ihi nke ahụ, NDLEA emezigharịla nke ọma karịa ka ọ dị na mbụ, usooro iji kwụsị mmepụta, ịkụ, nhazi, mbubata, mbupụ, ire, ịzụ ahịa na iji ọgwụike eme ihe na ihe ndị ọzọ iwu akwadoghị.Dịka ọ na-ekele ndị ọrụ ya maka ezi agbambọ ha, ọ dụkwara ndị na-etinye aka n'ọgwụ ike ka ha sepu aka na nke ahụ, n'ihi na ụlọọrụ ahụ na ndị ọrụ ya agaghị ada mbà n'ibu agha megide ihe ọbụla bụ ọgwụ ike n'ala Nigeria.Ọtụtụ ndị ọrụ gọọmenti na ndị ọzọ e ji okwu ha agba izu na ngalaba dị icheiche sonyekwara na mmemme ahụ.

Wed, 19 Jan 2022

All blogs